IGBO: JOHN 20:19-23.



19 Ya mere mbe o ruru anyasi, n'ubóchi ahu, bú ubóchi mbu n'izú mbe emechi-kwa-ra uzó nile ebe ndi nésó uzo-Ya nó, n'ihi egwu ndi-Ju, Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu.

20 Mbe O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua na akuku-Ya. Ya mere ndi neso uzó-Ya ñuriri oñu mbe ha huru Onye-nwe-ayi.

21 Ya mere Jisus siri ha ózó, Udo diri unu: dika Nnam ziteworom, otu a ka Mu onwem neziga kwa unu.

22 Mbe O kwusiri nka, O kusa ha ume, si ha, Naranu Mó Nsó

23 ndi nile o bula unu nabaghara nmehie-ha, abagharawo ha nye ha; ndi nile ó bula unu nejide nmehie-ha, ejidewo nmehie-ha.