IGBO: JOHN 20:19-23.
19 Ya mere mbe o ruru anyasi, n'ubóchi ahu,
bú ubóchi mbu n'izú mbe emechi-kwa-ra uzó
nile ebe ndi nésó uzo-Ya nó, n'ihi egwu ndi-Ju,
Jisus biara guzo n'etiti, si ha, Udo diri unu.
20 Mbe O kwusiri nka, O gosi ha aka-Ya abua
na akuku-Ya. Ya mere ndi neso uzó-Ya ñuriri oñu
mbe ha huru Onye-nwe-ayi.
21 Ya mere Jisus siri ha ózó, Udo diri unu:
dika Nnam ziteworom, otu a ka Mu onwem neziga kwa unu.
22 Mbe O kwusiri nka, O kusa ha ume, si ha,
Naranu Mó Nsó
23 ndi nile o bula unu nabaghara nmehie-ha,
abagharawo ha nye ha; ndi nile ó bula unu nejide nmehie-ha,
ejidewo nmehie-ha.